Psalms 83

Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf.

Ekpere maka mmeri

1O! Chineke agbachikwala nkịtị.
Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu,
anọkwala jụụ.
2Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ,
ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.
3Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị;
ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
4Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi,
ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”

5Ha ji otu obi na-agbarịta izu;
ha agbaala ndụ imegide gị,
6ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel,
na ndị Moab, na ndị Haga,
7na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek,
na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.
8Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha,
ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. Sela

9Mee ha dịka i si mee ndị Midia,
na dịka i mere Sisera na Jabin,
Eze Jabin na nwa ya Sisera, bụ ndị Debọra meriri nʼagha nʼugwu Taboa. Nkp 4:15-24; 5:20-21.
nʼakụkụ iyi Kishọn,
10ndị lara nʼiyi nʼEndoa
ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
11Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb,
Ha bụ ndị eze, bụrụkwa ndị ọchịagha ndị Midia. Ha so na ndị Gidiọn meriri nʼagha, Nkp 7:25

ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
12ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị,
ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”

13O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu,
maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
14Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa,
maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
15si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ,
jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
16Were ihere kpuchie ha ihu,
ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.

17Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile;
ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.
18Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị,
na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.
Copyright information for IboBIU